Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado...

31
Ezigbo AHA ONYE MKPỌTỤRỤ NA ỤLỌ ỌRỤ REDIO AHA m bụ, ana m arụrụ ndị Cultural Survival ọrụ, ụlọ ọrụ anaghị enwe uru nke ya na amaala na-enwe mmekọrịta iji chekwaa ala, asụsụ, omenala na ikikere ha. Ana m akpọku gị ka isonyere olu anyị n’ikuku iji chekwaa ikikere dịịrị Ndị Amaala. Cultural Survival na-emepụta mmemme redio nke anaghị akwụ ụgwọ iji gwa ndị obodo ụwa gba gburugburu gbasara ikikere dịịrị ha maka nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara (FPIC) tupu otu ndị si esi ejiri ala ha, akụkụ obodo, yana akụnụba ala ha mee ihe. Nke a bụ njikọ gị na mmemme redio ndị ahụ: JIKỌỌ OGBE NDỊ AKỌWAPỤTARA Enwere odiyo ya naanị na asụsụ ole ma ole mana anyị nwere ederede ya na *Igbo* bụ nke agbakwunyere. Ọ bụrụ na ọmasịrị gị ịtụgharị na asụsụ nke dabara ndị na-ege gị ntị, anyị nwekwara mmasị ịnata otu ṅomi ya. Anyị ga-anabata nzaghachi gị. Biko zaghachi ma ọ bụrụ na ụlọ ọrụ gị nwere mmasị isonye ma ọ bụ na ọ nwere ajụjụ. Maka ajụjụ ọzọ gbasara Cultural Survival, biko gaa na webụsaịtị anyị na www.culturalsurvival.org Onye nke gị AHA

Transcript of Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado...

Page 1: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Ezigbo AHA ONYE MKPỌTỤRỤ NA ỤLỌ ỌRỤ REDIO

AHA m bụ, ana m arụrụ ndị Cultural Survival ọrụ, ụlọ ọrụ anaghị enwe uru nke ya na amaala na-enwe mmekọrịta iji chekwaa ala, asụsụ, omenala na ikikere ha. Ana m akpọku gị ka isonyere olu anyị n’ikuku iji chekwaa ikikere dịịrị Ndị Amaala.

Cultural Survival na-emepụta mmemme redio nke anaghị akwụ ụgwọ iji gwa ndị obodo ụwa gba gburugburu gbasara ikikere dịịrị ha maka nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara (FPIC) tupu otu ndị si esi ejiri ala ha, akụkụ obodo, yana akụnụba ala ha mee ihe.

Nke a bụ njikọ gị na mmemme redio ndị ahụ: JIKỌỌ OGBE NDỊ AKỌWAPỤTARA

Enwere odiyo ya naanị na asụsụ ole ma ole mana anyị nwere ederede ya na *Igbo* bụ nke agbakwunyere. Ọ bụrụ na ọmasịrị gị ịtụgharị na asụsụ nke dabara ndị na-ege gị ntị, anyị nwekwara mmasị ịnata otu ṅomi ya.

Anyị ga-anabata nzaghachi gị. Biko zaghachi ma ọ bụrụ na ụlọ ọrụ gị nwere mmasị isonye ma ọ bụ na ọ nwere ajụjụ.

Maka ajụjụ ọzọ gbasara Cultural Survival, biko gaa na webụsaịtị anyị na www.culturalsurvival.org

Onye nke gịAHA

Page 2: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

1. Gịnị bụ Nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara?

Onye okwu 1:

Ịma ihe bụ ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara?

Onye okwu 2:

Ee! Ọ bụ ikikere na a ga-akọwapụtara ndị obodo anyị gbasara igwu ala, mmanụ a

na-egwuta n’ala, mmiri na atụmatụ ọrụ ndị ọzọ enwere ike ịme n’ime obodo anyị. Kedu ihe

ọzọkwa, gọọmentị nwere ọrụ dịịrị ha ịge ntị ma were echiche anyị kpọrọ ihe, ka anyị were nwee

ike jikọọ aka ọnụ tụpụta nkwekọrịta tupu amalite atụmatụ ọ bụla.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent[culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 3: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

2. Ikikere dịịrị Ndị Amaala

Onye okwu 1:

Site ka amụrụ onye, mmadụ ọ bụla nwere ụfọdụ ikikere dịịrị ya nke enweghị ike

ịnapụ ya, ma dịka Ndị Amaala, anyị nwere ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na

mbụ, Akọwapụtara.

Onye okwu 2:

Obodo onye si enweghị ihe ọ pụtara, ikikere nke a metụtara onye ọ bụla na a ga-

emejuputa ya mgbe gọọmentị chọrọ ịmanye aka na akụnụba ala ekereụwa dị n’ime obodo anyị,

tụmadị mgbe atụmatụ ọrụ ndị a ga-akpali mgbanwe mmebi n’ala anyị.

Onye nkọwa

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent[culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 4: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

3. Jide Ndị Ụlọ Ọrụ maka Azịza

Onye okwu 1:

Kwa nkeji oge n’afọ ọ bụla, Ana m eche echiche gbasara inwe ụkọ owuwe ihe

ubi, anyị enweghịzị ala zuru anyị kemgbe ụlọ ọrụ ahụ batara na obodo anyị.

Onye okwu 2:

Ọ bụ eziokwu na ha napụrụ anyị ala anyị na-enwetaghị nkwenye anaghị akwụ

ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara.

Ikikere nke a na-echekwa anyị dịka obodo ndị amaala, na-enyekwa anyị ikike na ọ nweghị ọrụ ọ

bụla a ga-eme n’ime ala anyị nke ụlọ ọrụ ma ọ bụ gọọmentị

agaghị ebu ụzọ gwa anyị, kpọtụrụ anyị ma gee anyị ntị.

Ka anyị malite ijide ụlọ ọrụ a maka azịza.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent[culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 5: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

4. Ndị ọchịchị

Onye okwu 1:

Abụ m Onye Amaala. Enwere m ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ,

Emere na mbụ, Akọwapụtara, mana gọọmentị na-eji ọtụtụ ụzọ aghụghọ were zenarị idobe

ikikere ndị a. Otu n’ime ụzọ aghụghọ ndị a bụ ịchọpụta ndị ọchịchị obodo anyị were gbanwee

echiche ha site na ngarị, ịnye ọrụ na nkwa dị ọzọ, iji rụrụ naanị ndị gọọmentị ọrụ na nnọchite

anya ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị mmepe, kama ịme maka mmasị kacha mma nke obodo niile nke ha na-

anọchite anya ya. N’ihi nke a, ọ dị ezigbo mkpa na dịka Ndị Amaala ka anyị họpụta ndị ọchịchị

nwere agụụ ma nwee mmasị maka ịdịmma nke anyị na ala anyị, na anyị na ndị ọchịchị ndị a ga-

arụkọkwa ọrụ ọnụ iji gaa n’ihu yana ịdịnotu.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 6: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

5. Nkwuputa UN, Akwụkwọ akụkọ 10

Onye okwu 1:

Maka obodo ndị amaala, Akwụkwọ Akụkọ 10 nke Nkwuputa UN gbasara Ikikere

dịịrị Ndị Amaala kwadoro ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ,

Akọwapụtara, bụ nke kwuputara na gọọmentị agaghị eji ike chụpụ obodo ndị amaala n’ala ma ọ

bụ akụkụ obodo ha, ma ọ bụ mee atụmatụ ọrụ ọ bụla eji ndị ọrụ ngo eme n’ala ndị Amaala

n’enwetaghị Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 7: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

6. Nkwuputa UN, Akwụkwọ akụkọ 19

Onye okwu 1:

(olu ndaghachi azụ) Akwụkwọ akụkọ 19 nke Nkwuputa UN gbasara Ikikere dịịrị

Ndị Amaala kwuputara (olu nkịtị) na ndị steeti kwesịrị ịnata Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ,

Emere na mbụ, Akọwapụtara tupu amalite ịnabata ma tinye n’ọrụ usoro mmebe iwu ma ọ bụ

nchịkwa na-emetụta ha

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 8: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

7. Obodo Ndị Echekwara

Onye okwu 1:

Dịka ndị Amaala anyị nwere ikikere ibi n’obodo echekwara, na mgbe a na-eme

ihe mgbanwe n’ala anyị, anyị kwesịrị ilele Akwụkwọ akụkọ29 nke Nkwuputa UN gbasara

Ikikere dịịrị Ndị Amaala: Akwụkwọ akụkọ a na-akwado na Ndị Amaala ga-enye Nkwenye

Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara tupu amalite ichekwaba ma ọ bụ kpofu ihe

ndị na-emerụ ahụ n’ala ha.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 9: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

8. Atụmatụ ọrụ Mmepe

Onye okwu 1:

(site n’igwe okwu were ekwu okwu) Enweghị mgbanwe a ga-eme n’ala anyị tupu

nke mbụ itinye n’ọrụ Akwụkwọ akụkọ 32 nke Nkwuputa UN

gbasara ikikere dịịrị Ndị Amaala nke na-akwado na ndị steeti ga-

anatarịrị Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ,

Akọwapụtara tupu akwado atụmatụ ọrụ mmepe ọ bụla nke ga-

emetụta ala na akụnụba ala nke Ndị Amaala, “tụmadị n’ihe

gbasara mmepe, iji ma ọ bụ manye aka na ihe ngwuputa ala,

mmiri ma ọ bụ akụnụba ala ndị ọzọ.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 10: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

9. Nkwado Mba Ofesi

Onye okwu 1:

Dịka ndị Amaala, anyị nwere ikikere ikpebi na mgbanwe nke enwere ike ịme

n’ala anyị, dịka ekwuputara na Nkwuputa United Nations gbasara Ikikere dịịrị Ndị Amaala yana

Ọgbakọ 169 nke International Labor Organization na ụzọ mba ofesi ndị ọzọ nke nabatara ikikere

nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara. Ụzọ ndị a na-ekwuputa

ikikere dịịrị ndị amaala ma rịọ ndị steeti ka ha sọpụrụ ikikere ndị a.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 11: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

10. Ikikere nke Anaghị Anapụnwu

Onye okwu 1:

Maka Ndị Amaala, ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ,

Akọwapụtara bụ ikikere dị oke mkpa, dị adị, anaghị anapụnwu. Nke a pụtara na ọ bụ ihe dị

mkpa, bara uru maka ịmebe atụmatụ ọrụ ndị na-emetụta anyị nke enweghị ike ịgọnarị anyị.

Dabere na iwu mba ofesi, Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara na-ahụ

na obodo Ndị Amaala na-eji aka ha kpebie na atụmatụ ọrụ ndị nwere ike ịbara anyị na ndị agbụrụ

ọdịnihu uru, dabere na omenala, echiche ndị ụwa yana ụkpụrụ anyị.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 12: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

11. Ngabiga Ikikere dịịrị Mmadụ Ezuola

Njikwa: egwu mpaghara na gburugburu

Onye okwu 1:

Ụtụtụ ọma!

Onye okwu 2:

Ndeewo, kedu ka o si aga?

Onye okwu 1:

Ọ dị mma, daalụ. Ị nụrụ na enwere ụlọ ọrụ ọhụrụ n’obodo? Ha amalitela ịwe ndị

mmadụ maka ịrụ na nnukwu atụmatụ ọrụ ịwụ ihe ọwụwụ n’obodo anyị ebe a.

Onye okwu 2:

GỊNỊ? Enweghị ka m si mara… Ekweghị m na gọọmentị gara n’ihu lelie ikikere

dịịrị anyị nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara bụ nke metụtara

anyị dịka Ndị Amaala. Ha kwesịrị ịgwa anyị ma gee echiche anyị ntị ma anyị ekwenyere

ma ọ bụ na anyị ekwenyeghị na atụmatụ ọrụ ndị a. Tụmadị ebe edepụtara ikikere ndị a

nke ọma na iwu obodo na nke mba ofesi.

Onye okwu 1:

Ikwutere ya kpam kpam. O doro anya na gọọmentị anaghị agbasi mbọ ike ịmanye

nke a. Ọ bụrụ na anyị agbadoghị ụkwụ rịọ ka ha sọpụrụ ikikere dịịrị anyị nke nkwenye

anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara, ikikere na iwu ndị a ga-abụ naanị na

akwụkwọ dị n’elu ebe nkwasa ihe dị otu ebe na-eku etum. Ndị Ụlọ Ọrụ ga-aga n’ihu na-

agabiga ikikere anyị ma na-awakpo Ndị Amaala anya.

Onye okwu 3:

Page 13: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Anyi enweghị ike ma hapụ ka nke a mee. Ngabiga ikikere dịịrị mmadu ezuola!

Ka anyị kwụpụta maka ikikere anyị yana maka nchekwa nke Elu Ụwa!

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 14: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

12. Ihe “Anaghị Akwụ Ụgwọ” pụtara

Njikwa: egwu gburugburu

Onye okwu 1:

Ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara bụ

ikikere nke gbasara Ndị Amaala niile, nke atụmatụ ọrụ na-echere ihu n’obodo anyị.

Njikwa: egwu nkeji oge (ntakịrị nkeji oge 3)

Onye okwu 2:

Ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara? Gịnị

ka ọ pụtara na akwụghị ụgwọ nkwenye?

Njikwa: egwu nkeji oge (ntakịrị nkeji oge 3)

Onye okwu 1:

Akụkụ gbasara “anaghị akwụ ụgwọ” pụtara na egbochidoro gọọmentị n’ụdị ọ

bụla ịtụgharị echiche ndị ọchịchị na ndị obodo n’ihe banyere mkpebi ha, gbasara ma ha

ahapụrụ ma ọ bụ na ha ahapụghị atụmatụ ọrụ n’ime obodo anyị. N’ime oge usoro nrụrịta

ụka, agaghị amanye Ndị Amaala n’ụzọ ọ bụla ka enwee ụfọdụ mkpebi. Nke a gụnyere iyi

egwu metụtara ma ọ bụ nke emetụtaghị ndị obodo, mbibi, mmanye, ịnye ngarị, ma ọ bụ

mmaja ịnapụ ego. Ọ bụ naani site n’ịhụ na nrụrịta ụka maka atụmatụ ọrụ enweghị ụdị ihe

mkpagbu ndị a, ka gọọmentị ga-eji dobe ikikere nke nkwenye “anaghị akwụ ụgwọ”

n’ezie.

Onye okwu 2:

Page 15: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Anyi ga-agbado ụkwụ rịọ na ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na

mbụ, akọwapụtara bụ N’EFU kpam kpam.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

13. Ihe “Emere na mbụ” pụtara

Njikwa :<<Ụda igwe mmadụ na-eme ngagharị iwe >>

Onye okwu 1:

Bilie! Kwụrụ ọtọ! Enweghị oge ka mma karịa ugbu a iji gbado ụkwụ rịọ ka

gọọmentị tinye n’ọrụ ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ,

akọwapụtara bụ nke ekwere anyị nkwa dịka Ndị Amaala!

Njikwa: egwu nkeji oge (ntakịrị nkeji oge 3)

Onye okwu 2:

ḷmaara, nke a nwere nnukwu akọ. Ọ ga-abụ nnukwu ihe ịga n’ihu ma ọ bụrụ na

gọọmentị agbaso ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara

n’uju ya. Nke kacha efu efu bụ atụmatụ nke nkwenye emere na mbụ. Nkwenye nke

enwetere tupu mmalite atụmatụ ọrụ ma ọ bụ nkwado gọọmentị bụ isi. Ọ pụtara na anyị

ga-enwe oge zuru oke ka obodo niile tinye ọnụ na mkpebi. Ọ BỤ N’EZIE! Anyị ga-enwe

ozi zuru oke, akọwapụtara nke ọma TUPU atụmatụ ọrụ ndị a amalite, ka anyị were nwee

ike nyochaa wee mee mkpebi n’onwe anyị dịka otu ndị. Kedu ihe ọzọ, ha ga-agụnyerịrị

anyị tupu mmalite ọkwa ọhụrụ nke usoro ahụ, ọmụmaatụ, nyocha, ngwuputa, nkwụsị na

nhicha nke ọrụ igwu ala.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent

Page 16: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

[culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

14. Ihe “Nkọwapụta” pụtara

Njikwa: egwu gburugburu

Onye okwu 1:

M na gị, dịka otu n’ime ndị obodo Amaala, ekwere anyị nkwa ikikere nkwenye

anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara.

Njikwa: egwu nkeji oge (ntakịrị nkeji oge 3)

Ikikere nke a dị oke mkpa maka mmepe nke obodo ọ bụla ga-adigide. Yamere a

ga-etinyerịrị ya n’ọrụ n’uju. Ka anyị lelee ihe ọ pụtara ịnye nkwenye nke akọwapụtara.

“Nkọwapụta” pụtara na anyị nwere ikikere ịnata ozi n’uju, zuru oke gbasara atụmatụ ọrụ

mmepe nke amara amụma ya n’obodo anyị. Nke a gụnyere ozi gbasara mmetụta atụmatụ

ọrụ ndị a na gburugburu anyị, yana kwa mmetụta ya n’onwe anyị dịka mmadụ yana

obodo. Mmụta nyocha emere iji kpokota ozi a bụ nke amara dị ka Environmental and

Social Impact Assessments, ma ọ bụ ESIA, bụ nke ekwesịrị ka otu ndị nọrọ onwe ha na

enweghị ihe jikọrọ ha n’ụlọ ọrụ mee. Ozi niile nke enyere ga-ezurịrị oke, kwe nghọta

n’asụsụ anyị, ma dabere n’ụkpụrụ ọdịnala anyị yana ụzọ ịme mkpebi. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị

ịgba mbọ hụ na akọwapụtara anyị nke ọma tupu anyị eme mkpebi ga-emetụta ndị nke

anyị na ala anyị.

Onye nkọwa:

Page 17: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

15. Kedu Mgbe Ọ Na-emetụta?

Onye okwu 1:

Ụtụtụ ọma, kedu ka ịmere?

Onye okwu 2:

Ọ dị mma, daalụ. Ndeewo, kedu ka nzụkọ ụnyahụ mere? Gịnị ka akpara?

Onye okwu 1:

Ọ dị ụtọ n’ezie. Anyị kpara maka ikikere dịịrị maka Nkwenye Anaghị Akwụ

Ụgwọ, Emere na mbụ, Akọwapụtara.

Onye okwu 2:

Mana gịnị ka ọ bụ? Ị nwere ike ịkọwakwu ya?

Onye okwu 1:

Ọ na-arụtụ aka na ikikere anyị nwere dịka Ndị Amaala iji chekwaba ala anyị na

akụkụ obodo anyị, ikikere nke ekwuputara na iwu obodo na nke mba ofesi.

Onye okwu 2:

Ọ dị mma, mana kedu ka anyị ga-esi jiri nke a? Kedu ụdịrị ọnọdụ ọ bụ?

Onye okwu 1:

Anyị nwere ike ma kwesị itinye ya n’ọrụ mgbe ọ bụla a na-akpa maka atụmatụ

ọrụ ọ bụla n’ala anyị tụmadị mgbe enwere ihe egwu mmebi gburugburu anyị. Ebe ọ bụ

n’anyị bụ ndị bi n’ala ndị a, ga-ahụkwa nsonazụ so ya, ọ dịịrị anyị ikpebi ma atụmatụ ọrụ

Page 18: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

ndị a aga agaba n’ihu. Ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ,

akọwapụtara na-edepụta na ndị ụlọ ọrụ kwesịrị ịkpọtụrụ anyị ma kwanyere mkpebi anyị

ugwu tupu ha amalite atụmatụ ọrụ. Anyị kwesịrị ịmụtakwu gbasara ya, ọ dị ka ihe dịrị

obodo anyị nnukwu mkpa!

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

Page 19: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

16. Ọrụ dịịrị gị

Njikwa: ụda nke ọkpụkpọ redio na-achọ nnweta ikuku(ntakịrị nkeji oge 3)

Onye okwu 1:

Ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara bụ ikikere

anyị nwere dịka Ndị Amaala ka anyị na-agba mgba ichekwaba ala anyị. Anyị ga-

agbadorịrị ụkwụ rịọ ka asọpụrụ ikikere anyị.

Njikwa: egwu nkeji oge (ntakịrị nkeji oge 3)

Onye okwu 2:

Nnukwa nna, gee ntị n’ihe ha na-ekwu na redio; ọ dị gị n’ezie ka ọ bara uru ka ndị

nke anyị gbaa mgba ikikere nke nkwenye?

Onye okwu 3:

Ee, nwa m! Ikikere ndị a na-echekwa ụkpụrụ anyị; ọ ga-ewetara ndị nke anyị

ọtụtụ elele yana ụwa niile. Ka m kọwaa: N’iji ikikere a, anyị nwere ike ichekwa

gburugburu anyị, wee hụ na enwere mmiri dị ọcha, ikuku ọcha, na ndị nke anyị nwere ike

ibi na gburugburu nwere ahụike. Anyị nwere ike ịhụ na anyị gbaziri atụmatụ ọrụ ndị a

ụzọ na mgbanwe ọ bụla nke emere n’ala anyị ga-abụ elele kama ihe mmerụ ahụ ebe ndị

nke anyị nọ.

Onye okwu 2:

Page 20: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Ugbu a aghọtago m, Nnukwu nna! Nke a dị mkpa. Ekele dịrị ndị agbụrụ gị,

Enwere m ebe dị mma ibi. Aga m emejuputa ọrụ dịịrị m ilekọta gburugburu m ka m were

nwee ike hapụkwara ụmụaka m na ụmụ ụmụaka m ọmarịcha ala.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

17. Kewaa wee Merie

Onye okwu 1:

Kewaa wee merie: Nke a bụ ụzọ aghụghọ ndị ụlọ ọrụ na gọọmentị iji gaa n’ihu na

atụmatụ ọrụ mmepe na Obodo Ndị Amaala. Ọ bụ otu n’ime ọmụmaatụ ka ha si ada

ijigide ikikere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara nke Obodo

Ndị Amaala. Iwu mba ofesi kọwapụtara ka odoo anya na gọọmentị ekwesịghị ịmanye

anyị ka anyị gbanwee obi anyị, ma ọ bụ ụkpụrụ, ma ọ bụ ụzọ mkpebi ọdịnala anyị. Ọtụtụ

oge, ndị nnukwu ụlọ ọrụ na-agbalị ịgba okirikiri n’usoro nke iji nweta nkwenye anaghị

akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara n’ihi na ha maara na anyị agaghị ekwenyerịrị

atụmatụ ọrụ mmepe nwere ihe egwu, na-emerụ ahụ nke anaghị ahapụrụ anyị ihe

mgbanwe dị mma ọ bụla. Kama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado

mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka ndị nkuzi, ndị

ọchịchị ụka, ma ọ bụ ndị ọchịchị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’iji ozi ụgha ma ọ bụ ngarị. Anyi

agaghị akwụgidere nke a. Ọ dịịrị anyị ịgba mbọ hụ na emejuputara ikikere nke nkwenye

anaghị akwụ ụgwọ, emere na mbụ, akọwapụtara n’uju ya. Anyi agaghị ahapụ ka ejiri

Page 21: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

nkewa na mpụ tinye udo, ndakọrịta, na ike nke obodo anyị na gburugburu anyị n’ihe

egwu.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

18. Nzụkọ Obodo

Onye okwu 1:

(Nwute) Ndeewo, Kedu ka ihe dị…

Onye okwu 2:

Ọ dị mma, daalu! Mana ọ dị ka ịdara juu, gịnị na-eme?

Onye okwu 1:

Enwere m nnukwu ihe nchekasị. Ana m anụ asịrị gbasara atụmatụ ọrụ igwu ala

nke akwadogoro maka obodo anyị. Ọ dighị mma na ndị ọ dị n’aka agwabeghị anyị ihe

na-aga. Ha anaghị eso usoro ikikere anyị nwere nke nkwenye anaghị akwụ ụgwọ, emere

na mbụ, akọwapụtara bụ nke anyị nwere dịka Ndị Amaala. Amatara m na ọ bụ ọrụ ndị

steeti ịgbaso ikikere ndị a n’uju ya mgbe a na-eme atụmatụ ọrụ mmepe dị ka nke a..

Onye okwu 2:

Page 22: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Ị nwetara ya kpọm kwem. Anyị ga-agba mbọ hụ na ha sọpụrụ ikikere anyị, site na

ịkọwapụtara anyị, ịnweta nkwenye anyị tupu mmalite atụmatụ ọrụ dị otu a. Dịka ọmụmaatụ,

mgbe ụdịrị atụmatụ ọrụ a bịara na obodo m, anyị mere nzụkọ iji sochie ihe niile na-eme anya,

yana kwa, anyị chapụrụ anya n’ihe gbasara ijide ụlọ ọrụ ahụ maka azịza maka nkwa ha kwere ma

gbaa mbọ hụ na ha rụrụ ọrụ ahụ dịka ekwekọrịtara na nrụrịta ụka anyị. Ọ ga-abụ ezigbo ụzọ

aghụghọ obodo gị ga-eji - anyị agaghị aga n’ihu ahapụ ọrụ ndị a ka ha gaba n’ihu na anataghị

nkwenye anyị.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ cs.org/consent]

19. Ihe FPIC pụtara

Onye okwu 1:

Ị mara ihe ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ, Emere na mbụ,

Akọwapụtara bụ maka ya?

Onye okwu 2:

Ee! Ọ bụ ikikere anyị nwere dịka Ndị Amaala ikpebi ihe na-eme n’ala anyị.

Onye okwu 1:

Na, ịmaara ka anyị ga-esi etinye ikikere nke a n’ọrụ nke ọma n’obodo anyị?

Onye okwu 2:

Hmm, amachaghị m.

Onye okwu 1:

Page 23: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

Dịka otu n’ime ndị Amaala obodo anyị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ịchọ ozi akọwapụtara

nke ọma gbasara ikikere nke a, ka ndị gọọmentị na ndị ụlọ ọrụ ghara ịtụgharị echiche

anyị. Iji mee ka ikikere a pụta ihie, anyị ga-aghọtarịrị na ọ nwere ike metụta Ndị Amaala

niile, na ọ pụtara na ndị gọọmentị na ndị ụlọ ọrụ ga-asọpụrịrị ụzọ mkparịta ụka anyị na

mkpebi anyị. Ọ pụtara na ndị nnọchite anya gọọmentị na ndị obodo ga-abịakọ ọnụ rụrịta

ụka n’usoro nke atụmatụ ọrụ ahụ, na anyị nwere okwu ikpeazu iji kwenye n’atụmatụ nke

ga-abara obodo anyị uru.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent [culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ

cs.org/consent]

20. Ndụmọdụ

Njikwa: egwu mpaghara na gburugburu

Onye okwu 1:

Ị maara usoro ekwesịrị isoro iji mee ikikere nke Nkwenye Anaghị Akwụ Ụgwọ,

Emere na mbụ, Akọwapụtara n’etiti Ndị Amaala nke ọma?

Njikwa: egwu nkeji oge (ntakịrị nkeji oge 3)

Onye okwu2:

Iji mepụta ikikere nke a ka ọ dịtụ mma maka mmadụ niile, anyị kwesịrị itule

ndụmọdụ ndị a mgbe atụmatụ ọrụ mmepe chere anyị ihu n’ala anyị. Ekwesịrị ịkpọtụrụ

Ndị Amaala site na oge mmalite ịkpa atụmatụ ahụ. Ekwesịrị ịnye ndị obodo niile oge

zuru oke iji nata ozi niile dị mkpa metụtara atụmatụ ọrụ ahụ na mmetụta ọ nwere, ma nye

ohere maka mkparịta ụka na nrụtụ aka ndị ahụ. Ekwesịrị ịnye ozi dabere na ụzọ ọdịnala

Page 24: Spots 1-20 Igbo Transcripts  · Web viewKama, ha na-agbalị igosi onwe ha ka ha anatara nkwado mpaghara gbasara agbasa site na ịwe n’ọrụ ndị mmadụ nwere agba dị ka

ndị nke anyị. Ekwesịrị inwe mkpebi n’enweghị ntụgharị echiche ma ọ bụ nkwanye site

n’aka ndị ọrụ ahụ dị n’aka. Aga edekọba mkpebi niile ndị obodo ahụ mere nke ọma. Ọ

bụrụ na agabiga ikikere nke ọ bụla n’ime ndị a, cheta na enwere ụzọ ndị anyị nwere ike

iji chọọ enyemaka ma jụ ngabiga ikikere dịịrị mmadụ ndị a na ewumewu mba ofesi dị ka

United Nations.

Onye nkọwa:

Maka ozi ndị ọzọ, gaa na cultural survival ntụpọ org nkeji ihu consent

[culturalsurvival.org/consent ma ọ bụ

cs.org/consent]